9 O wee sị ndị ikom ahụ: “Amaara m na Jehova ga-enye unu ala a,+ nakwa na ụjọ unu ejidela anyị,+ nakwa na obi na-alọ ndị niile bi n’ala a mmiri n’ihi unu.+
11 Mgbe anyị nụrụ ya, obi malitere ịlọ anyị mmiri,+ ọ dịghịkwa ume ọ bụla dị n’ime onye ọ bụla n’ihi unu,+ n’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu bụ Chineke n’eluigwe nakwa n’ụwa.+