25 Jehova ga-eme ka e merie gị n’ihu ndị iro gị.+ Otu ụzọ ka ị ga-esi gaa ibuso ha agha, ma ị ga-esi n’ụzọ asaa gbaa ọsọ n’ihu ha; ị ga-aghọkwa ihe ga-eme ka alaeze niile nke ụwa tụọ ụjọ.+
17 Otu puku mmadụ ga-ama jijiji n’ihi ịba mba nke otu onye;+ n’ihi ịba mba nke mmadụ ise, unu ga-agbakata ọsọ ruo mgbe ndị fọdụrụ n’etiti unu ga-adị ka osisi ákwà ụgbọ mmiri nke dị n’elu ugwu, dịkwa ka ihe mgbaàmà e gwunyere n’elu ugwu.+