25 “Ọ bụrụ na i nwee ụmụ na ụmụ ụmụ, ọ bụrụkwa na unu ebie ogologo oge n’ala ahụ ma mee omume na-eweta mbibi+ wee mee ihe oyiyi a pịrị apị,+ bụ́ ọdịdị nke ihe ọ bụla, ọ bụrụkwa na i mee ihe ọjọọ n’anya Jehova bụ́ Chineke gị+ iji kpasuo ya iwe,
26 ana m ewere eluigwe na ụwa+ dị ka ndị akaebe megide unu taa, na unu ga-alarịrị n’iyi ọsọ ọsọ pụọ n’ala ahụ unu na-agafe Jọdan inweta. Ụbọchị unu ga-ebi na ya agaghị adị ọtụtụ, n’ihi na a ga-alarịrị unu n’iyi.+