20 N’ihi na ihe Jehova mere ha bụ ikwe ka obi ha kpọchie+ ka ha buso Izrel agha, ka o wee bibie ha, ka a ghara imere ha ebere,+ kama ka ọ laa ha n’iyi, dị nnọọ ka Jehova nyere Mozis n’iwu.+
15 Eze egeghịkwa ndị ahụ ntị,+ n’ihi na ihe a na-emenụ si n’aka Jehova,+ ka Jehova wee mezuo ihe ọ gwara+ Jeroboam nwa Nibat site n’ọnụ Ahaịja+ onye Shaịlo.