22 “‘Mgbe unu na-ewe ihe ubi nke ala unu, unu ewerechala ihe dị n’ọnụ ọnụ ubi unu mgbe unu na-ewe ya, unu atụtụkọtala ihe unu wefọrọ n’ubi unu.+ Unu ga-ahapụ ha maka ndị nọ n’ahụhụ+ na ndị mbịarambịa.+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.’”
19 “Ọ bụrụ na i wee ihe ubi n’ubi gị, i wee chefuo otu ùkwù ọka* n’ubi,+ agaghachila ibute ya. Ọ ga-adịrị onye mbịarambịa, nwa na-enweghị nna nakwa nwaanyị di ya nwụrụ;+ ka Jehova bụ́ Chineke gị wee gọzie gị n’ihe niile aka gị na-eme.+