Jenesis 47:11 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 11 Josef wee mee ka nna ya na ụmụnne ya biri n’ala Ijipt, o wee nye ha ala n’ebe kasị nnọọ mma n’ala ahụ, n’ala Ramesis,+ dị nnọọ ka Fero nyere n’iwu. Ọpụpụ 20:12 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 12 “Sọpụrụ nna gị na nne gị+ ka ụbọchị gị wee dị ogologo n’ala Jehova bụ́ Chineke gị ga-enye gị.+ Ilu 23:24 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 24 Nna onye ezi omume aghaghị ịṅụrị ọṅụ;+ onye bụ́ nna nke onye maara ihe ga-aṅụrịkwa ọṅụ n’ihi ya.+ Matiu 19:19 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 19 Sọpụrụ nna gị na nne gị,+ na, Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.”+
11 Josef wee mee ka nna ya na ụmụnne ya biri n’ala Ijipt, o wee nye ha ala n’ebe kasị nnọọ mma n’ala ahụ, n’ala Ramesis,+ dị nnọọ ka Fero nyere n’iwu.