5 Devid wee malite ije agha. Ebe ọ bụla Sọl zigara ya, ọ na-eji akọ eme ihe,+ nke mere na Sọl mere ya onyeisi ndị ikom na-aga agha;+ ọ dịkwa mma n’anya ndị Izrel niile nakwa n’anya ndị na-ejere Sọl ozi.
13 N’ihi ya, Sọl wepụrụ ya ka ya na ya ghara ịdị na-anọ+ ma họpụta ya ịbụ ọchịagha otu puku ndị agha; ọ na-apụkwa ma na-abata mgbe niile n’ihu ndị Izrel.+