16 “Ụdị ugbu a echi, m ga-ezitere gị otu nwoke si n’ala Benjamin,+ tee ya mmanụ+ ịbụ onye ndú nke ndị m bụ́ Izrel; ọ ga-azọpụtakwa ndị m n’aka ndị Filistia,+ n’ihi na ahụwo m mmekpa ahụ́ nke ndị m, mkpu ákwá ha eruwokwa m ntị.”+
5 Ma ndị Filistia zukọtara ibuso Izrel agha, ya bụ, ụgbọ ịnyịnya+ agha ndị dị iri atọ na puku mmadụ isii ndị na-agba ịnyịnya nakwa ndị dị ọtụtụ dị ka ájá dị n’ụsọ oké osimiri;+ ha wee gbagoo malite ịma ụlọikwuu na Mikmash n’ebe ọwụwa anyanwụ Bet-even.+