27 Ma ndị ikom na-abaghị n’ihe+ sịrị: “Olee otú onye a ga-esi zọpụta anyị?”+ Ha wee leda ya anya,+ ha ewetaghịkwara ya onyinye ọ bụla.+ Ma ọ gbachiri nnọọ nkịtị.+
25 Biko, ka onyenwe m ghara itinye uche na nwoke a na-abaghị n’ihe+ bụ́ Nebal, n’ihi na otú aha ya dị ka ya onwe ya dị. Nebal bụ aha ya, nzuzu dịkwa ya n’ahụ́.+ Ma mụ onwe m, bụ́ ohu gị nwaanyị, ahụghị ụmụ okorobịa onyenwe m, bụ́ ndị i zitere.
22 Otú ọ dị, nwoke ọjọọ ọ bụla na-abaghị n’ihe+ n’ime ndị ikom ahụ ha na Devid so gaa zara ma na-asị: “Ebe ọ bụ na ha esoghị anyị gaa, anyị agaghị enye ha ihe ọ bụla si n’ihe nkwata anyị napụtara, ma e wezụga ịkpọnye onye nke ọ bụla nwunye ya na ụmụ ya ndị ikom, ka ha duru ha laa.”