23 Jehova wee sị ya: “Mba abụọ nọ gị n’afọ,+ mba abụọ ndị ga-esi n’afọ gị pụta ga-ekewa;+ otu mba ga-aka mba nke ọzọ ike,+ nke okenye ga-ejekwara nke nwata ozi.”+
29 Ka ndị dị iche iche jeere gị ozi, ka mba dị iche iche kpọọkwara gị isiala.+ Bụrụ onyeisi ụmụnne gị, ka ụmụnne gị kpọọkwara gị isiala.+ Ka onye ọ bụla n’ime ndị na-abụ gị ọnụ bụrụ onye a bụrụ ọnụ, ka onye ọ bụla n’ime ndị na-agọzi gị bụrụ onye a gọziri agọzi.”+
37 Ma Aịzik zara Isọ, sị: “Lee, emewo m ya onyeisi gị,+ enyewo m ya ụmụnne ya niile ka ha bụrụ ndị na-ejere ya ozi,+ enyewokwa m ya ọka na mmanya ọhụrụ iji kwado ya,+ olee ihe dịnụ m ga-emere gị, nwa m?”