2 “Gwa ụmụ Izrel, sị, ‘Ọ bụrụ na nwaanyị atụrụ ime+ wee mụọ nwa nwoke, nwaanyị ahụ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo ụbọchị asaa; ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha dị ka ọ na-adị mgbe ọ na-ahụ nsọ ya.+
19 “‘Ọ bụrụ na ihe na-agbapụta nwaanyị n’ahụ́, ihe ahụ na-agbapụta ya n’ahụ́ ewee bụrụ ọbara,+ ọ ga-anọ n’adịghị ọcha+ nke ịhụ nsọ ya+ ruo ụbọchị asaa, onye ọ bụla metụrụ ya aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.