45 Ma ndị Izrel sịrị Sọl: “Jọnatan ọ̀ ga-anwụ, bụ́ onye mere ka e nwee nzọpụta a dị ukwuu+ n’Izrel? Tụfịakwa!+ Dị nnọọ ka Jehova dị ndụ,+ otu ntutu isi+ ya agaghị ada n’ala; n’ihi na ya na Chineke rụrụ ọrụ taa.”+ Ndị Izrel wee si otú a napụta+ Jọnatan, ọ nwụghịkwa.
11 Ma ọ sịrị: “Biko, eze, cheta Jehova bụ́ Chineke gị,+ ka onye ọbọ ọbara+ ghara ịnọ na-akpata mbibi mgbe niile, ka a gharakwa ịla nwa m nwoke n’iyi.” O wee sị: “Dị nnọọ ka Jehova dị ndụ,+ otu ntutu isi+ nke nwa gị nwoke agaghị ada n’ala.”
34 Ya mere, ana m agba unu ume ka unu ritụ ihe oriri, n’ihi na nke a bụ maka nzọpụta unu; n’ihi na ọ dịghị otu ntutu+ isi nke otu onye n’ime unu ga-ala n’iyi.”