-
1 Samuel 14:6Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
-
-
6 Jọnatan wee gwa onye na-ejere ya ozi, nke na-eburu ya ihe agha, sị: “Bịa ka anyị gafere banye n’ebe ahụ ndị ikom ahụ a na-ebighị úgwù+ nọ na-eche nche. Ma eleghị anya, Jehova ga-arụrụ anyị ọrụ, n’ihi na ọ dịghị ihe na-egbochi Jehova isi n’aka ọtụtụ mmadụ ma ọ bụ n’aka mmadụ ole na ole mee ka e nwee nzọpụta.”+
-
-
2 Ihe E Mere 14:11Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
-
-
11 Esa wee malite ịkpọku Jehova bụ́ Chineke ya,+ sị: “Jehova, a bịa n’inye aka, ma ndị mmadụ hà dị ọtụtụ ma ọ bụ na ha adịghị ike, o nweghị ihe o mere n’ebe ị nọ.+ Jehova bụ́ Chineke anyị, biko, nyere anyị aka n’ihi na anyị dabeere n’ebe ị nọ,+ anyị jikwa aha gị+ na-ebuso ìgwè mmadụ a agha. Jehova, ọ bụ gị bụ Chineke anyị.+ Ekwela ka mmadụ efu kara gị ike.”+
-