13 Jehova wee na-adọ Izrel+ na Juda+ aka ná ntị+ site n’ọnụ ndị amụma+ ya niile na ndị ọhụụ+ niile, sị: “Hapụnụ ụzọ ọjọọ+ unu ma debe ihe m nyere n’iwu+ na ụkpụrụ+ m, dị ka iwu+ dum m nyere nna nna unu hà+ si dị, nke m ziteere unu site n’ọnụ ndị ohu m bụ́ ndị amụma”;+
4 nke m gwara nna nna unu hà n’ụbọchị m kpọpụtara ha n’ala Ijipt,+ n’oké ọkụ e ji agbaze ígwè,+ wee sị, ‘Rubenụ isi n’ihe m kwuru, meekwanụ ihe niile m nyere unu n’iwu;+ unu ga-abụ ndị m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke unu,+