32Mgbe Hezekaya mesịrị ihe ndị a, meekwa omume ikwesị ntụkwasị obi a,+ Senakerib+ eze Asiria+ bịara wakpo Juda, maakwa ụlọikwuu iji buso obodo ndị e wusiri ike agha,+ o bukwa n’obi ime ka ha bụrụ nke ya site n’imeri ha.
36O wee ruo n’afọ nke iri na anọ nke ọchịchị Eze Hezekaya, na Senakerib+ eze Asiria+ gbagotere buso obodo niile e wusiri ike ndị dị na Juda agha, wee weghara ha.+