19 “Ọ bụrụ na ị nọchibido obodo ruo ọtụtụ ụbọchị wee na-ebuso ya agha ka i weghara ya, ebibila osisi ndị dị na ya site n’igbu ha anyụike; n’ihi na ị ga-eri mkpụrụ ha, egbutukwala ha,+ n’ihi na osisi dị n’ọhịa ọ̀ bụ mmadụ nke mere ị ga-eji nọchibido ya?