4 M ga-eme ka ị tụgharịa, tinyekwa nko n’agba gị+ wee dọrọ gị na ndị agha gị niile,+ ya bụ, ịnyịnya na ndị na-agba ịnyịnya, ha niile yi uwe mara mma,+ ìgwè mmadụ dị ukwuu, ndị ji ọta ukwu na ọta nta, ha niile bu mma agha;+
2 Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova aṅụwo iyi n’ịdị nsọ ya,+ sị, ‘“Lee! Ụbọchị na-abịakwasị unu. Ọ ga-ejikwa nko nke onye na-egbu anụ kolie unu elu, jirikwa nko azụ̀ kolie ndị fọdụrụ n’ime unu elu.+