3 O wee wughachi ebe ndị dị elu Hezekaya nna ya bibiri,+ o wukwaara Bel ebe ịchụàjà ma mee ogwe osisi dị nsọ, dị nnọọ ka Ehab+ eze Izrel mere. O wee malite ịkpọrọ ìgwè ihe niile dị n’eluigwe+ isiala,+ na-efekwa ha ofufe.+
6 O surekwara* nwa ya n’ọkụ.+ O mekwara anwansi,+ chọọ ihe mgbaàmà ọdịnihu, kwekwa ka ndị na-agba afa+ na ndị ọrụ ha bụ ịkọ ọdịnihu+ nọrọ. O mere ihe jọrọ njọ n’anya Jehova nke ukwuu iji kpasuo ya iwe.