13 Hezekaya wee gee ha ntị ma gosi ha ụlọ ndebe akụ̀+ ya dum, ọlaọcha na ọlaedo+ na mmanụ bọlsọm+ na ezigbo mmanụ na ngwá agha ya na ihe niile dị n’ebe a na-edebe akụ̀ ya. Ọ dịghị ihe Hezekaya na-egosighị ha n’ụlọ ya nakwa n’ebe niile ọ na-achị.+
17 ‘“Lee! Ụbọchị na-abịa, mgbe a ga-eburu ihe niile dị n’ụlọ gị,+ ihe nna nna gị hà kwakọbakwara ruo taa, laa Babịlọn.+ Ọ dịghị ihe ga-afọdụ,”+ ka Jehova kwuru.
6 ‘Lee! Ụbọchị na-abịa, mgbe a ga-eburu ihe niile dị n’ụlọ gị, ihe nna nna gị hà kwakọbakwara ruo taa, laa Babịlọn.’+ ‘Ọ dịghị ihe ga-afọdụ,’+ ka Jehova kwuru.