17 O wee ruo mgbe ihe ndị a gasịrị na nwa nwoke nke nwaanyị ahụ, bụ́ nwaanyị nwe ụlọ ahụ, dara ọrịa, ọrịa ya wee sie ike nke na ume afọdụghị n’ime ya.+
12 N’ihi na mmadụ+ adịghị ama oge ya.+ Dị nnọọ ka azụ̀ e ji ụgbụ ọjọọ+ jide, dịkwa ka nnụnụ a nwụdere n’ọnyà,+ otú ahụ ka a na-amata ụmụ mmadụ n’ọnyà n’oge ọdachi,+ mgbe ọ na-adakwasị ha na mberede.+