33 Ma m ga-achụsasị unu ná mba dị iche iche,+ m ga-amịpụtakwa mma agha n’ọbọ ka ọ chụwa unu;+ ala unu ga-aghọkwa ebe tọgbọrọ n’efu,+ obodo unu dị iche iche ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe tọgbọrọ n’efu.
26 ana m ewere eluigwe na ụwa+ dị ka ndị akaebe megide unu taa, na unu ga-alarịrị n’iyi ọsọ ọsọ pụọ n’ala ahụ unu na-agafe Jọdan inweta. Ụbọchị unu ga-ebi na ya agaghị adị ọtụtụ, n’ihi na a ga-alarịrị unu n’iyi.+
36 Jehova ga-eme ka gị+ na eze+ gị nke ị ga-eme ka ọ chịwa gị gaa ná mba ị na-amaghị, bụ́ nke gị onwe gị ma ọ bụ nna nna gị hà na-amaghị; n’ebe ahụkwa ka ị ga-efe chi ọzọ ndị e ji osisi na nkume mee.+
64 “Jehova ga-achụsasị gị n’etiti ndị niile malite n’otu nsọtụ ụwa ruo na nsọtụ ọzọ nke ụwa,+ n’ebe ahụkwa ka ị ga-efe chi ọzọ ndị ị na-amaghị, ndị gị onwe gị ma ọ bụ nna nna gị hà na-amaghị, bụ́ osisi na nkume.+
27 Kama Jehova sịrị: “M ga-ewepụkwa Juda+ n’ihu m,+ dị nnọọ ka m wepụrụ Izrel;+ m ga-ajụkwa obodo a nke m họọrọ, ya bụ, Jeruselem, nakwa ụlọ ahụ nke m kwuru banyere ya, sị, ‘Aha m ga-adịgide na ya.’”+
9 m ga-emekwa ka ha ghọọ ihe na-akpata ịma jijiji na ndị ọdachi ga-adakwasị n’alaeze niile nke ụwa,+ meekwa ka ha ghọọ ihe nkọcha na ihe e ji atụ ilu na ihe ịkwa emo+ na ihe a bụrụ ọnụ+ n’ebe niile m ga-achụsasị ha.+
25 ‘“N’ihi na mụ onwe m, bụ́ Jehova, ga-ekwu ihe m ga-ekwu, a ga-emekwa ya.+ A gakwaghị agbatị oge ọ ga-emezu,+ n’ihi na n’ụbọchị unu,+ unu ụlọ na-enupụ isi, m ga-ekwu okwu, meekwa ya,” ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.’”
14 Mụ onwe m, Jehova, ekwuwo ya.+ Ọ ga-abịa,+ m ga-emekwa ihe. M gaghị eleghara ya anya,+ m gaghị eme ebere,+ m gaghịkwa agbanwe obi m.+ Ha ga-ekpe gị ikpe dị ka ụzọ gị niile na omume gị niile si dị,’+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.”