49 “Jehova ga-eme ka mba nke nọ n’ebe dị anya,+ nke si n’ebe ụwa sọtụrụ, buso gị agha, dị nnọọ ka ugo si efekwasị n’ihe ọ ga-eburu,+ ya bụ, mba nke ị na-agaghị aghọta asụsụ ya,+
10 Sịkwa ha, ‘Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru: “Lee, m ga-ezi ozi, m ga-akpọrọ Nebukadreza eze Babịlọn,+ bụ́ ohu m,+ m ga-edebe ocheeze ya kpọmkwem n’elu nkume ndị a m zoro, ọ ga-agbasakwa ụlọikwuu ọma ya n’elu ha.