7 “M ga-edebe ọgbụgba ndụ m nke dị n’etiti mụ na gị+ na mkpụrụ gị nke ga-anọchi gị n’ọgbọ ha niile ka ọ bụrụ ọgbụgba ndụ ruo mgbe a na-akaghị aka,+ ka m wee gosi na m bụ Chineke gị nakwa Chineke nke mkpụrụ gị nke ga-anọchi gị.+
9 Ị makwaara nke ọma na Jehova bụ́ Chineke gị bụ ezi Chineke,+ Chineke nke kwesịrị ntụkwasị obi,+ onye na-edebere ndị hụrụ ya n’anya na ndị na-edebe ihe o nyere n’iwu ọgbụgba ndụ+ ya ma na-egosi ha obiọma* ruo otu puku ọgbọ,+
33 “N’ihi na nke a bụ ọgbụgba ndụ+ mụ na ụlọ Izrel ga-agba mgbe ụbọchị ndị ahụ gasịrị,”+ ka Jehova kwuru. “M ga-etinye iwu m n’ime ha,+ m ga-edekwa ya n’obi ha.+ M ga-abụ Chineke ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị m.”+