6 Nweenụ obi ike, dịkwanụ ike.+ Atụla egwu, amakwala jijiji n’ihu ha,+ n’ihi na ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka gị na ya so na-aga. Ọ gaghị agbahapụ gị, ọ gaghịkwa ahapụ gị ma ọlị.”+
7 “Naanị nwee obi ike, dịkwa ike nke ukwuu ka i wee lezie anya mezuo iwu ahụ dum nke Mozis ohu m nyere gị.+ Ahapụla ya gaa n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe,+ ka i wee jiri amamihe mee ihe n’ebe ọ bụla ị na-aga.+