18 Otu n’ime ndị na-ejere ya ozi wee zaa, sị: “Lee! Ahụwo m otú nwa Jesi onye Betlehem si bụrụ ọkà n’ịkpọ ụbọ,+ ọ bụ nwoke dị ike nke bụ́ dimkpa,+ bụrụkwa dike n’agha,+ ọ bụ ọkà okwu maara ihe+ na nwoke mara mma,+ Jehova nọnyekwaara ya.”+
20 Ma, ọ bụ Benaya,+ nwa Jehoyada,+ nwa otu nwoke bụ́ dike, onye mere ọtụtụ ihe na Kabzil,+ gburu ụmụ ndị ikom abụọ nke Ariel onye Moab; ọ bụkwa ya gbadara wee gbuo ọdụm+ n’ime olulu mmiri n’ụbọchị snoo na-ada.+