30 N’ụmụ Hibrọn,+ Hashabaya na ụmụnne ya, bụ́ ndị ikom ruru eru,+ ndị dị otu puku mmadụ na narị asaa, na-elekọta ndị Izrel bi n’ógbè Jọdan, n’ebe ọdịda anyanwụ, n’ihe metụtara ọrụ Jehova dum nakwa ozi a na-ejere eze.
7 N’ihi na egbugbere ọnụ onye nchụàjà kwesịrị ichekwa ihe ọmụma, ndị mmadụ kwesịkwara ịchọ iwu n’ọnụ ya;+ n’ihi na ọ bụ onye ozi Jehova nke ụsụụ ndị agha.+