34 E ji osisi junipa rụọ ibo ụzọ abụọ ahụ.+ Ibo abụọ nke otu ọnụ ụzọ na-emeghe ihu na azụ n’ihe nkonye ha, ibo abụọ nke ọnụ ụzọ nke ọzọ na-emeghekwa ihu na azụ.+
24 Ehaz chịkọtakwara arịa+ ndị dị n’ụlọ ezi Chineke, gbukasịakwa arịa ndị dị n’ụlọ ezi Chineke+ ma mechie ọnụ ụzọ+ ụlọ Jehova, wee meere onwe ya ebe ịchụàjà n’akụkụ ngalaba ụzọ ọ bụla na Jeruselem.+