5 O wee sị ha: “Ụmụ Livaị, geenụ m ntị. Doonụ onwe unu nsọ,+ dookwanụ ụlọ Jehova bụ́ Chineke nna nna unu hà nsọ, wepụkwanụ ihe na-adịghị ọcha n’ebe nsọ.+
20 Ebe ọ bụ na ndị nchụàjà na ndị Livaị mere onwe ha ka ha dị ọcha+ dị ka otu ìgwè, ha niile dị ọcha, ha wee gbuo anụ ememme ngabiga+ maka ndị niile bụbu ndị a dọọrọ n’agha nakwa maka ụmụnne ha ndị nchụàjà nakwa maka onwe ha.