6O wee ruo n’afọ nke narị anọ na iri asatọ mgbe ụmụ Izrel pụtasịrị n’ala Ijipt,+ n’afọ nke anọ,+ n’ọnwa Ziv,+ ya bụ, n’ọnwa nke abụọ,+ mgbe Sọlọmọn ghọsịrị eze Izrel, ọ malitere iwuru Jehova ụlọ.+
7 Ma ụlọ ahụ, ka a nọ na-ewu ya, ọ bụ nkume a wacharala awa+ ka e ji wuo ya; a nụghịkwa ụda hama na anyụike ma ọ bụ ngwá ọrụ ọ bụla bụ́ ígwè n’ụlọ+ ahụ ka a na-ewu ya.