10 O wee gaa n’ihu ịsị ha: “Laanụ, rienụ ihe mara abụba, ṅụọkwanụ ihe na-atọ ụtọ, zigakwaranụ+ onye ọ na-enweghị ihe a kwadebeere ya ihe; n’ihi na taa dị nsọ n’ebe Onyenwe anyị nọ, unu enwekwala mwute, n’ihi na ọṅụ Jehova bụ ebe unu e wusiri ike.”
19 Ọ bụ ya mere ndị Juu bi n’ime ime obodo, ndị bi n’ógbè ndị dịpụrụ adịpụ, ji na-eme ka abalị iri na anọ n’ọnwa Eda+ bụrụ ụbọchị ịṅụrị ọṅụ+ na nke iri oriri na ụbọchị ikpori ndụ+ na inyerịta ihe.+
22 ya bụ, ụbọchị ndị ahụ ndị Juu zuuru ndị iro+ ha ike na ọnwa e mere ka mwute+ ha na-enwe ghọọ ọṅụ, meekwa ka uju ha na-eru ghọọ ụbọchị ikpori ndụ, ka ha na-echeta ha dị ka ụbọchị iri oriri na ịṅụrị ọṅụ na inyerịta ihe+ na inye ndị ogbenye onyinye.+