10 N’ihi na anụrụ m akụkọ ọjọọ nke ọtụtụ ndị na-akọ.+ Ụjọ dị ebe niile. “Kọsaanụ ya, ka anyị kọsaa akụkọ ọjọọ banyere ya.”+ Onye ọ bụla na-asị m, “Udo dịrị gị!”—ha na-ele anya ka m tewe ụkwụ, ha na-asị:+ “Ikekwe, a ga-aghọgbu ya,+ ka anyị wee merie ya ma megwara ya ihe o mere anyị.”