Job 42:12 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 12 Jehova wee gọzie+ ikpeazụ Job karịa mmalite ya,+ o wee nwee atụrụ dị puku iri na anọ na kamel dị puku isii na puku ehi abụọ e jikọrọ abụọ abụọ nakwa otu puku nne ịnyịnya ibu. Job 42:16 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 16 Mgbe nke a gasịrị, Job dịrị ndụ ruo otu narị afọ na iri anọ,+ wee hụ ụmụ ya na ụmụ ụmụ ya,+ ọgbọ anọ. Ilu 28:10 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 10 Onye na-eme ka ndị ziri ezi kpafuo+ banye n’ụzọ ọjọọ, ya onwe ya ga-adaba n’olulu nke ya,+ ma ndị na-enweghị ntụpọ ga-enweta ihe ọma.+ Aịzaya 32:18 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 18 Ndị m ga-ebikwa n’ebe obibi nke udo dị nakwa n’ụlọ nke ha ga-ebi n’obi iru ala zuru ezu nakwa n’ebe izu ike nke nsogbu na-adịghị.+
12 Jehova wee gọzie+ ikpeazụ Job karịa mmalite ya,+ o wee nwee atụrụ dị puku iri na anọ na kamel dị puku isii na puku ehi abụọ e jikọrọ abụọ abụọ nakwa otu puku nne ịnyịnya ibu.
16 Mgbe nke a gasịrị, Job dịrị ndụ ruo otu narị afọ na iri anọ,+ wee hụ ụmụ ya na ụmụ ụmụ ya,+ ọgbọ anọ.
10 Onye na-eme ka ndị ziri ezi kpafuo+ banye n’ụzọ ọjọọ, ya onwe ya ga-adaba n’olulu nke ya,+ ma ndị na-enweghị ntụpọ ga-enweta ihe ọma.+
18 Ndị m ga-ebikwa n’ebe obibi nke udo dị nakwa n’ụlọ nke ha ga-ebi n’obi iru ala zuru ezu nakwa n’ebe izu ike nke nsogbu na-adịghị.+