20 E wee nyere ha aka ibuso ha agha, nke mere na e nyefere ndị Hega na ndị niile ha na ha so n’aka ha, n’ihi na ha kpọkuru Chineke maka enyemaka+ n’agha ahụ, o wee nabata arịrịọ ha n’ihi na ha tụkwasịrị ya obi.+
17 Ọ bụrụ na a tụba anyị n’ime ya, Chineke anyị bụ́ onye anyị na-efe ofufe ga-anapụtali anyị. Ọ ga-anapụta anyị n’oké ọkụ ahụ a kwanyere, napụtakwa anyị n’aka gị, eze.+
23 Eze wee ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu,+ o wee nye iwu ka a kpọpụta Daniel n’olulu ahụ. E wee kpọpụta Daniel n’olulu ahụ, ọkọ akọghịkwa ya, n’ihi na ọ tụkwasịrị Chineke ya obi.+