14 Ị ga-aṅụrịkwa ọṅụ n’oge ememme gị,+ gị na nwa gị nwoke na nwa gị nwaanyị na ohu gị nwoke na ohu gị nwaanyị na onye Livaị na onye mbịarambịa na nwa na-enweghị nna nakwa nwaanyị di ya nwụrụ, bụ́ ndị bi n’obodo gị.
16 Kwenụ ka okwu nke Kraịst biri n’ime unu n’ụba, ka o meekwa ka unu nwee amamihe niile.+ Jirinụ abụ ọma+ na otuto a na-enye Chineke na abụ ime mmụọ+ na amara na-ezi ibe unu ihe,+ na-adụkwa ibe unu ọdụ, na-abụkunụ Jehova abụ n’ime obi unu.+