Ndị Ikpe 5:11 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 11 A na-anụ olu ụfọdụ n’ime ndị na-enye anụmanụ mmiri n’ebe ndị a na-eseta mmiri,+N’ebe ahụ ka ha malitere ịkọ ọrụ ezi omume Jehova,+Ọrụ ezi omume nke ndị ya bi n’obodo a na-agbaghị ogige n’Izrel.Ọ bụ mgbe ahụ ka ndị Jehova gbadara n’ọnụ ụzọ ámá. Abụ Ọma 17:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 Mee ka mmeso obiọma* gị dị ebube,+ gị Onye Nzọpụta nke ndị na-achọ ebe ha ga-agbabaIji zere ndị na-enupụrụ aka nri gị isi.+ Abụ Ọma 60:5 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 5 Ka e wee napụta ndị ị hụrụ n’anya,+Biko, jiri aka nri gị zọpụta anyị ma za anyị.+ Abụ Ọma 98:2 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 2 Jehova emewo ka a mara nzọpụta ya;+O kpughewo ezi omume ya n’anya mba dị iche iche.+
11 A na-anụ olu ụfọdụ n’ime ndị na-enye anụmanụ mmiri n’ebe ndị a na-eseta mmiri,+N’ebe ahụ ka ha malitere ịkọ ọrụ ezi omume Jehova,+Ọrụ ezi omume nke ndị ya bi n’obodo a na-agbaghị ogige n’Izrel.Ọ bụ mgbe ahụ ka ndị Jehova gbadara n’ọnụ ụzọ ámá.
7 Mee ka mmeso obiọma* gị dị ebube,+ gị Onye Nzọpụta nke ndị na-achọ ebe ha ga-agbabaIji zere ndị na-enupụrụ aka nri gị isi.+