18 “Bịanụ ka anyị kpezie,” ka Jehova kwuru.+ “Ọ bụrụgodị na mmehie unu na-acha uhie uhie, m ga-eme ka ọ na-acha ezigbo ọcha;+ ọ bụrụgodị na ọ na-acha ọbara ọbara dị ka ákwà uhie, ọ ga-adị ka ajị ọcha.
11 Ma nke ahụ bụkwa ihe ụfọdụ n’ime unu bụbu.+ Ma a sachawo unu,+ ma e dowo unu nsọ,+ ma a kpọwo unu ndị ezi omume+ n’aha Onyenwe anyị Jizọs Kraịst+ nakwa site ná mmụọ nke Chineke anyị.+