23 Ọ ga-emekwa ka mmiri zooro mkpụrụ ị kụrụ n’ala,+ nyekwa gị ihe oriri dị ka mkpụrụ nke ala, bụ́ nke ga-ama abụba, gbaakwa mmanụ.+ Anụ ụlọ gị ga-ata nri n’ụbọchị ahụ n’ebe ịta nri nke sara mbara.+
27 Osisi ndị dị n’ọhịa ga-amị mkpụrụ,+ ala ha ga-emepụtakwa ihe nke ọma,+ ha ga-anọkwa n’ala ha n’obi iru ala.+ Ha ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova mgbe m gbajiri osisi yok+ ha wee napụta ha n’aka ndị ji ha na-agba ohu.+