33 “‘Unu emerụla ala unu bi; n’ihi na ọ bụ ọbara na-emerụ ala,+ ọ dịghịkwa ihe e ji ekpuchiri ala mmehie maka ọbara a wụfuru na ya, ma e wezụga ọbara nke onye wụfuru ọbara.+
21 N’ihi na, lee! Jehova si n’ebe ọ nọ na-abịa ime ka ndị bi n’ala a zaa ajụjụ maka njehie ha.+ Ala a ga-ekpughekwa ọbara ndị ọ wụfuru,+ ọ gakwaghị ekpuchi ndị ya e gburu egbu ọzọ.”+