66 N’ụbọchị nke asatọ, ọ hapụrụ ndị ahụ ka ha lawa;+ ha wee malite ịgọzi eze, ha jikwa ọṅụ+ na obi ụtọ+ laa n’ụlọ ha, n’ihi ihe ọma+ niile Jehova meere Devid bụ́ ohu ya na Izrel bụ́ ndị ya.
7 M ga-ekwu okwu banyere obiọma* Jehova,+ banyere otuto Jehova, dị ka ihe niile Jehova meere anyị si dị,+ bụ́ oké ịdị mma ya n’ebe ụlọ Izrel nọ,+ nke o gosiri ha dị ka ebere ya+ na obiọma ya si dị ukwuu.
12 Ha ga-abịa tie mkpu ọṅụ n’ebe dị elu na Zayọn,+ ihu ha ga na-egbuke egbuke n’ihi ịdị mma Jehova,+ n’ihi ọka* na mmanya ọhụrụ+ na mmanụ na ụmụ ìgwè ewu na atụrụ na ụmụ ehi.+ Mkpụrụ obi ha ga-adịkwa ka ubi mmiri na-ede nke ọma,+ ha agakwaghị ahụsi anya ọzọ.”+