7 Ọ̀ dị onye na-agaghị atụ egwu gị,+ gị Eze mba niile?+ N’ihi na ọ bụ gị ka e kwesịrị ịtụ egwu; n’ihi na o nwetụdịghị onye dị ka gị n’etiti ndị niile maara ihe ná mba dị iche iche nakwa n’alaeze ha niile.+
17 Ka Eze mgbe ebighị ebi,+ onye a na-apụghị ibibi ebibi,+ onye a na-apụghị ịhụ anya,+ onye naanị ya bụ Chineke,+ bụrụ onye nsọpụrụ na otuto dịịrị ruo mgbe niile ebighị ebi.+ Amen.