Ndị Ikpe 1:1 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 1 O wee ruo na mgbe Jọshụa nwụsịrị,+ ụmụ Izrel jụrụ Jehova ase,+ sị: “Ònye n’ime anyị ga-ebu ụzọ gaa buso ndị Kenan agha?” 1 Samuel 18:14 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 14 Devid wee jiri akọ na-eme ihe+ mgbe niile n’ụzọ ya niile, Jehova nọnyekwaara ya.+ Ilu 24:6 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 6 N’ihi na ị ga-eji ezi ntụziaka buo agha gị,+ ọtụtụ ndị ndụmọdụ na-emekwa ka e nwee nzọpụta.+ Luk 14:31 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 31 Ma ọ bụ, olee eze nke na-aga ibuso eze ọzọ agha, nke na-agaghị ebu ụzọ nọdụ ala gbaa izu ma ò nwere ike iji puku ndị agha iri lụso onye ji puku ndị agha iri abụọ na-abịa imegide ya ọgụ?+
1 O wee ruo na mgbe Jọshụa nwụsịrị,+ ụmụ Izrel jụrụ Jehova ase,+ sị: “Ònye n’ime anyị ga-ebu ụzọ gaa buso ndị Kenan agha?”
31 Ma ọ bụ, olee eze nke na-aga ibuso eze ọzọ agha, nke na-agaghị ebu ụzọ nọdụ ala gbaa izu ma ò nwere ike iji puku ndị agha iri lụso onye ji puku ndị agha iri abụọ na-abịa imegide ya ọgụ?+