18 Otu n’ime ndị na-ejere ya ozi wee zaa, sị: “Lee! Ahụwo m otú nwa Jesi onye Betlehem si bụrụ ọkà n’ịkpọ ụbọ,+ ọ bụ nwoke dị ike nke bụ́ dimkpa,+ bụrụkwa dike n’agha,+ ọ bụ ọkà okwu maara ihe+ na nwoke mara mma,+ Jehova nọnyekwaara ya.”+
23 Ndụmọdụ Ahitofel, bụ́ ndị o nyere n’ụbọchị ndị ahụ, na-adị nnọọ ka mgbe mmadụ jụtara ihe ezi Chineke kwuru. Ọ bụ otú ahụ ka ndụmọdụ+ Ahitofel+ na-adị Devid na Absalọm.
14 Ọ bụ nwa otu nwaanyị di ya nwụrụ nke si n’ebo Naftalaị, nna ya bụkwa onye Taya,+ onye na-arụ ọrụ ọla kọpa;+ o jupụtakwara n’amamihe na nghọta+ na ihe ọmụma e ji arụ ụdị ọrụ ọ bụla a na-eji ọla kọpa arụ. O wee bịakwute Eze Sọlọmọn ma malite ịrụ ọrụ ya niile.