5 Devid wee malite ije agha. Ebe ọ bụla Sọl zigara ya, ọ na-eji akọ eme ihe,+ nke mere na Sọl mere ya onyeisi ndị ikom na-aga agha;+ ọ dịkwa mma n’anya ndị Izrel niile nakwa n’anya ndị na-ejere Sọl ozi.
2 M wee mee ka Hanenaị+ nwanne m na Hananaya bụ́ onyeisi Ebe E Wusiri Ike+ bụrụ ndị na-elekọta Jeruselem, n’ihi na Hananaya bụ nwoke kwesịrị ntụkwasị obi,+ ọ na-atụkwa egwu+ ezi Chineke karịa ọtụtụ ndị ọzọ.