Ilu 15:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 Egbugbere ọnụ ndị maara ihe na-ekesa ihe ọmụma,+ ma obi ndị nzuzu adịghị otú ahụ.+ Aịzaya 50:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova enyewo m ire nke ndị a kụziiri ihe,+ ka m wee mata otú m ga-esi zaa onye ike gwụrụ okwu.+ Ọ na-akpọte m kwa ụtụtụ; ọ na-akpọte ntị m ịnụ ihe dị ka ndị a kụziiri ihe.+ Luk 4:22 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 22 Ha niile wee malite ịgba àmà dị mma banyere ya, okwu ọma+ ndị si n’ọnụ ya na-apụta tụkwara ha n’anya, ha wee na-asị: “Onye a ọ́ bụghị nwa Josef?”+
4 Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova enyewo m ire nke ndị a kụziiri ihe,+ ka m wee mata otú m ga-esi zaa onye ike gwụrụ okwu.+ Ọ na-akpọte m kwa ụtụtụ; ọ na-akpọte ntị m ịnụ ihe dị ka ndị a kụziiri ihe.+
22 Ha niile wee malite ịgba àmà dị mma banyere ya, okwu ọma+ ndị si n’ọnụ ya na-apụta tụkwara ha n’anya, ha wee na-asị: “Onye a ọ́ bụghị nwa Josef?”+