14 O wee dọrọ Jeruselem dum n’agha,+ tinyere ndị isi niile+ na ndị dimkpa niile bụ́ ndị dike+—puku mmadụ iri ka ọ dọọrọ n’agha—nakwa onye ọ bụla bụ́ omenkà+ na onye na-ewu mgbidi siri ike. Ọ dịghị onye a hapụrụ ma e wezụga ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha+ n’ime ndị ala ahụ.
10 Ma Nebuzaradan bụ́ onyeisi ndị nche hapụrụ ụfọdụ n’ime ha, bụ́ ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha, ndị na-enweghị ihe ọ bụla, n’ala Juda;+ n’ụbọchị ahụ, o nyere ha ubi vaịn na ọrụ nke ọ manyere ha ka ha na-arụ.+