14 O wee gaa n’ihu ịgwa ha okwu dị ka ndụmọdụ ụmụ okorobịa nyere ya si dị,+ sị: “Nna m mere ka yok unu dị arọ, ma mụ onwe m ga-atụkwasị ihe na yok unu. Nna m pịara unu ụtarị nkịtị, ma mụ onwe m ga-apịa unu ụtarị akpụkpọ anụ.”+
16 Mgbe Izrel dum hụrụ na eze egeghị ha ntị, ha zara eze, sị: “Olee òkè anyị nwere na Devid?+ Ọ dịghịkwa ihe nketa anyị nwere na nwa Jesi. Lakwuru chi gị,+ Izrel! Lekwa ụlọ gị, Devid!+ Ndị Izrel wee lawa n’ụlọikwuu ha.