5 ma ọ bụ, ọ bụrụ na ya na mmadụ ibe ya abanye n’ọhịa ịkpata nkụ, ọ bụrụkwa na o weliri aka iji anyụike gbutuo osisi, isi anyụike ahụ ewee fepụ n’osisi ya,+ ọ bụrụkwa na ọ kụta mmadụ ibe ya, onye ahụ anwụọ, ya onwe ya kwesịrị ịgbaga n’otu n’ime obodo ndị a wee dịrị ndụ.+