Ọpụpụ 1:6 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 6 E mesịa, Josef nwụrụ,+ tinyere ụmụnne ya niile nakwa ọgbọ ahụ dum. Abụ Ọma 89:47 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 47 Cheta afọ ole m ga-adị ndụ.+Ọ̀ bụ naanị n’efu ka i kere ụmụ mmadụ niile?+ Abụ Ọma 90:10 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 10 Afọ ndụ anyị na-adị afọ iri asaa;+Ọ bụrụkwa na anyị enwee ike pụrụ iche, ha na-adị afọ iri asatọ,+Ma ha jupụtara ná nsogbu na ihe ọjọọ;+N’ihi na ha ga-agafe ngwa ngwa, anyị ewee ghara ịnọkwa.+ Ekliziastis 12:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 Ájá ewee laghachi n’ala+ dị nnọọ ka ọ dịbu, mmụọ+ alaghachikwurukwa ezi Chineke+ onye nyere ya.+ Zekaraya 1:5 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 5 “‘Olee ebe nna unu hà nọ?+ Ndị amụma+ hà dịruru ndụ mgbe ebighị ebi?
10 Afọ ndụ anyị na-adị afọ iri asaa;+Ọ bụrụkwa na anyị enwee ike pụrụ iche, ha na-adị afọ iri asatọ,+Ma ha jupụtara ná nsogbu na ihe ọjọọ;+N’ihi na ha ga-agafe ngwa ngwa, anyị ewee ghara ịnọkwa.+