20 “Ọ bụrụ na ị kụtusịa mkpụrụ dị n’osisi oliv gị, agaghachila ịkụtu ya ọzọ. Ọ ga-adịrị onye mbịarambịa, nwa na-enweghị nna nakwa nwaanyị di ya nwụrụ.+
6 Ihe e wefọrọ n’ubi ga-afọdụkwa n’ime ya dị ka mgbe a kụtusịrị mkpụrụ dị n’osisi oliv: mkpụrụ oliv abụọ ma ọ bụ atọ chara acha afọdụ n’elu alaka ya; mkpụrụ anọ ma ọ bụ ise afọdụ n’alaka ya nke na-amị mkpụrụ,” ka Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru.+