9 M ga-etinye otu ụzọ n’ụzọ atọ ahụ n’ọkụ;+ m ga-anụcha ha dị ka e si anụcha ọlaọcha,+ nwaleekwa ha dị ka e si anwale ọlaedo.+ Ma, ha ga-akpọku aha m, m ga-azakwa ha.+ M ga-asị, ‘Ha bụ ndị m,’+ ha onwe ha ga-asịkwa, ‘Jehova bụ Chineke anyị.’”+
11 “N’ihi na malite n’ebe ọwụwa anyanwụ ruo n’ebe ọdịda ya, aha m ga-adị ukwuu n’etiti mba niile,+ a ga-esurekwa ihe nsure ọkụ n’ebe niile,+ a ga-ewetara aha m onyinye, bụ́ onyinye dị ọcha;+ n’ihi na aha m ga-adị ukwuu n’etiti mba niile,”+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.